Connect with us

Igbo

Asusu Igbo : Nnamdi Kanu na-agbọ ụja n’efu – Arewa

Published

on

‘Arewa Youth Consultative Forum’ akatọọla okwu onye ndu IPOB bụ Nnamdi Kanu kwuru na ọ ga-eji “ọkụ mmụọ” lọghachite na Naịjirịa.
N’okwu onyeisi ha bụ Yerima Shettima gwara ndị ntaakụkọ, o kwuru na Naịjirịa etofeela ụdị mmaja ụmụaka ahụ.

Cheta na Kanu mgbe ọ na-agbasa ozi mbụ ya kamgbe ọpụtagharịrị ihe kwuru na ọ ga-eji “ọkụ mmụọ” lọghachite Naịjirịa.
Mana Arewa akatọọla okwu ahụ, ma kwuo na ịdị n’otu Naịjirịa abụghị ihe otu onye maọbụ otu ga-eleda anya.
Shettima kọwara iyi egwu Kanu dịka “ịgbọ ụja n’efu”, maa ya aka n’ihu ka ọ lọta Naịjirịa bịa kwuo ụdị okwu ahụ.

N’okwu ya “Anyị etofeela nke a, Naịjirịa etoola ma gbapụtakwa ihe mmadụ iyi ya egwu. Ihe a bụ obodo otu onye agaghị eleli ịdị n’otu ya anya.
“Echeghi m na Kanu nọ na Jerusalem n’ihi na ahụrụ m ozi mba Izrel wepụtara.
“Mana ọ bụrụ na ọ nọ ebe ahụ, ọbaghị uru ị nọ ebe ahụ ekwu okwu, ya lọta Naịjirịa bịa kwuo ya ka anyị mara na o siri ike.”

Continue Reading
Advertisement SiteLock

Igbo

Asusu Igbo :Buhari Waec Certificate: Onyeisiala anatala asambodo ya

Published

on

Onye Ose foto Buhari bụ Bayo Omoboriowo, wepụtara foto gosiri ka Buhari natara asambodo ọhụrụ ngalaba na-ahụ maka ule na West Afrịka bụ Waec nyere ya.
Nke bụ na Waec etinyela mmechi n’akụkọ banyere ma Buhari onwere asambodo etu o si kwuo na o nwere.

Buhari kwukwara sị na ọ bụ ya na Shehu Musa Yar’Adua nwụrụ anwụ gakọrọ otu ụlọakwụkwọ ma na praịmarị ma na sekọndrị ma sorokwa banye ọzụzụ ndị agha otu oge.

O kwuru na ya na Yar’Adua lere ule Waec n’afọ 1961.
Otu n’ime ọnụ na-ekwuchitere Buhari bụ Bashir Ahmed tinyere ihe nkiri gosiri ka Buhari na-anata asambodo ya ebe n’elu Twitter:

 

Continue Reading

Igbo

Gịnị mere ụfọdụ ụmụnwoke ji ‘alụ’ nwabebi?

Published

on

Ọ bughi ịhe ọhụrụ na ụfọdụ ụmụnwoke na-ejizi nwabebi eme enyi, kama ihe mgbawoju anya bụ etu ha si azụta ya n’agbanyeghi na ọ dara ọnụ.
Nwoke akpọrọ “Pretty Mike of Lagos” zụtara nwa bebi dịka onyinye o nyere onwe ya n’ụbọchị ncheta ọmụmụ ya.

Kamgbe o wepụtachara foto gosiri ebe ya na nwabebi nọ, ndị mmadụ nọ soshal midia etinyela ọnụ n’okwu ahụ.
Cheta na n’ọnwa Mee nke afọ a, otu otiegwu akpọrọ Shuga Shaa bụ onye Delta steeti kwuru na ọ zụtara nwabebi ya n’ọnụ otu nde naira (N1,000,000).

Ọ zutaara ya ụgboala ma kpọrọ ya na-aga ụlọ ihe nkiri.

Etu o si kwụrụ ugbua, “Pretty Mike of Lagos” depụtara n’elu soshal midia na “ndị mmadụ na-ahụ nwabebi dịka nke e ji enwe mmekọrịta mana mụ onwe m na-ahụ ya dịka onye nkasiobi, onye na-anọkete m
nakwa onye na-agaghị agbaghapụ m.”

 

Continue Reading

Igbo

Asusu Igbo: Imo APC Primaries: Ụwa gbara onye ọbụla gharị

Published

on

Echi bụ ụbọchị ikpeazụ INEC wepụtara maka ịnye ha aha ndị ga-ebụ ọkọrọtọ ndị pati nịịle nọ na Naịjịrịa bụ ndị ga-anọchite anya ha na ndọrọndọrọ ọchịchị 2019 dịka gọvano maọbụ ndi ọmeiwu.
Ka ọ dị ugbua onwebeghị onye ma ihe echi ga-eweta n’APC Imo steeti dịka ihe siri kwuru.

Ikpe ka dị n’ụlọikpe na etiti Uche Nwosu na Hope Uzodinma maka onye ga-ebutere APC ọkọrọtọ gọvanọ n’Imo steeti.
Chetakwa n’ụlọikpe yighariri ụbọchị ya bụ Ikpe mgbe amaghị ama, dịka ndị otu Rochas Okorocha na-arịọ ụlọikpe ukwu n’Abuja nke Justice Ishaq bello nọ n’isi ya ka ha kagbuo mkpebi ọkaikpe Othman Musa nke si na ọ bụ Hope Uzodimma meriri ya bụ ntuliaka APC n’Imo steeti.
Nke meburu mbụ bụ na okwu onyeisioche pati nọ n’ọchịchị bụ All Progressives Congress (APC) bụ Adams Oshiomhole kwuru banyere ntuliaka imeụlọ ndị APC mere n’Imo steeti mere ka ọ bụrụ na isi niile ndị mmadụ nyara na ntuliaka imeụlọ nke mbụ bụ n’efu.
Oshiomhole gara n’ihu kwuo na akwukwo abụọ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị Imo na-ewogharị na soshal media abụghị eziokwu.
Okwu a pụtara na Uche Nwosu, bụ ọgọ aka na-achị Imo steeti Rochas Okorocha, na Hope Uzodimma, bu onye bụ Sineto na-anọchịte anya Orlu zone n’Ụlọ Omeiwu nke Naịjirịa enweghị mmeri dịka ndị nkwado ha kwuru ụnyaahụ.

Cheta na akwụkwọ ndị oke APC nke na-ekweghị na nwepụta Rochas wopụtara Uche Nwosu wepụtara akwụkwọ gosiri na Hope Uzodimma ji vootu 423,895 merie ntuliaka ahụ. Onye binyere aka na ya bụ akwụkwọ bụ onye isi ndị APC bịara nhazi ntuliaka a bụ Ahmed Gulak.
N’aka ọzọ, Onye ode akwụkwọ mgbasa ozi APC n’Imo bụ Jones Onwuasoanya kwuru si  na ọ bụ Uche Nwosu merịrị.
Ọ gakwara n’ihu zitere anyị akwụkwọ onye ode akwụkwọ ndị kọmiti a binyere aka. Akwụkwọ a gosiri na Uche Nwosu meriri.
Nke bụ na tupu Oshiomhole jiri kagbuo ntuliaka, mmadu abụọ no ka ndị a sị meriri dịka ndị ga-azọ vootu na afọ 2019 dịka gọvanọ n’okpuru APC n’Imo steeti.
Ọtụtụ mmadu ndị a gbara ajụju ọnụ kwuru na ihe mere ntuliaka jiri dị ọkụ n’Imo ha were kwuo na ọ bụ maka ọtụtụ mmadụ chọrọ ohere ịchị Imo.

N’ime ha, Hope Uzodimma bụ onye Orlu Zone, bụ ebe ọtụtụ ndi chiri Imo na mbụ si. Gọvanọ Okorocha bụkwa onye Orlu zone.
Uche Nwosu bụ onye Umuokwe, Eziama-Obaire n’okpuru ọchịchị Nkwerre, nke sokwa n’ebe akpọro Ọrlụ Senatorial Zone na Bekee. Nke mere ka ọtụtụ mmadu na-ekwu na ebe Okorocha bụ ọgọ ya nwoke, ọ pụtara na ọchịchi ya ga-abu ndọtị nke Okorocha, dika Bekee na-akpọ ‘term’ ọzọ Okorocha nakwa Orlu Zone.

Eze Madumere bụ osote aka na-achị Imo, ma bụkwara otu n’ime ndị na-azọ ọkwa govanọ na steeti ahụ. Madumere bụ onye gburugburu Owere, bu ebe si na ọkwa rụru ha makana kemgbe ọchịchi onye kwuo uche ya nke mpaghara batara n’afọ 1999, ha enwebeghi nwa ha chịri steeti ahụ.
Atụmatụ ya ịzọ ọkwa gọvanọ so n’ihe tisara adụ na mma ya na Okorocha.
Madumere kwuru na ọbụghị makana ya ezughi ịchịta Imo mere Okorocha ejighi akwado ya.
Ndị ọzọ so zọọ ya bụ oche bụchakwa ndị metụtara Okorocha, dịka onye rụrụ ọrụ dịka onye odeakwụkwọ gọọmentị Imo steeti bụ George Etche na ogbo ya n’ọrụ gọọmentị Imo bu Jude Ejiogu.
Chima Anozie, Peter Gbuje, Chris Nzemoka na Chuks Ololo sokwa zọọ ya bụ ohere ịtụrụ ugo APC.

Continue Reading

Igbo

Asusu Igbo : Aga m akwụsị ndị mba ọzọ amụrụ n’Amerịka ị bụ ndị mba anyị – Trump

Published

on

Nwa mba ọzọ amụrụ na Amerịka agaghị abụzị nwafọ Amerịka .

Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump aṅụọla iyi na ọ ga-akwụsị ikike iwu kwuru na nwa ndị mba ọzọ a mụrụ na Amerịka ga-abụ nwafọ mba Amerịka.
Ọ gbarụrụ ihu na ọ bụ naanị Amerịka ka ụdị iwu a dị ire, ma kwuo na ọ ga-agbanwe iwu a ma ọ bụrụ na ndị ọchịchị tinyere aka n’akwụkwọ.
Trump kwuru na nke dị mkpa maka ibelata ọnụọgụgụ ndị mmadụ na-abata n’Amerịka kwa mgbe.

 

Continue Reading

Igbo

Asusu Igbo : Biafra – Onye bụ Mama Biafra?

Published

on

Ezigbo aha nwaanyị a bụ Felicia Ejezie.

Ezigbo aha nwaanyị a bụ Felicia Ejezie.
Ọ gbara afọ karịrị iri asaa.
Mama Biafra bụ onye Eziata Okpoto Umuisiobu nke Bende dị na okpuru ọchịchị Bende n’Abia steeti.

Mama Biafra nụrụ dị onye Anambra steeti na nwata mgbe a lụrụ agha Biafra na 1963.
Felicia mụtara ụmụ anọ bụ ndị bi n’ala bekee nke dịọkpara ya bụ onye agha na mba Amerịka.
Ọ rụbụrụ ọrụ na “Nigeria Ports Authority” bụ ebe ọ nọ laa ezumike nka rue ugbua.

Gịnị mere eji akpọ ya Mama Biafra?

Di Felicia bụ onye agha Naịjirịa manyere ya ka ọ lụwa ya mgbe ọ perempe a na-alụ agha Naịjirịa na Biafra.

Ihe mere o jiri zawa mama Biafra bụ maka ihe ọ gabigara mgbe agha.

Ndị uweojii kpụrụ ya ụbọchị Wenezde 24-10-18 maka na ha sị na ọ na ere akwụkwọ mgbasa ozi Ipob.

Ha kpụgara ya ụlọikpe bụ ebe nyere ya aka mbee na ego dị na puku narị naira atọ.

Continue Reading

Igbo

Asusu Igbo : Tony Anenih: Ị ma ihe jịkọrọ ya na Nnamdi Azikiwe?

Published

on

A mụrụ Anthony Akhakon ‘Tony’ Anenih na Uzenema-Arue dị n’Uromi nke Edo steeti n’afọ 1933.
Ọkwa ikpeazụ o nwere bụ Minista na-ahụ maka ihe gbasara ọrụ n’ụlọ obibi n’afọ 1999 mgbe Olusegun Obasanjo rịrị ọkwa onyeisiala.

Amalitere itu ya aha ‘Mr Fix It’ n’ihi mbọ ọ na-agba n’ihe gbasara ntuliaka ọ kachasị etu o si nye aka chiburu Edo steeti bụ Samuel Ogbemudia aka n’imeri ntuliaka ọkwa gọvanọ n’afọ 1983.
Ụfọdụ ụlọntaakụkọ dị na Naịjirịa na-ekwu n’ọnwụrụ ụnya ahụ n’ụlọọgwụ dịka ọrịachara ọrịa ihe ruru otu izuụka.

Lee ihe ise ị na-amaghị maka ya ebe a:

Azikiwe

1. Tony Anenih bụ bu otu n’ime ndị uweoji na-eche Nnamdi Azikiwe nche mgbe Azikiwe bụ Gọvanọ General ala Naịjrịa.

2. Mgbe onyeisiala Muhammadu Buhari chịburu Naijirịa n’okpuru ndịagha, a tụrụ Anenih nga ihe ruru ọnwa iri n’asatọ n’ihi na ọ bụ ọgaranya.
3. N’afọ 2017, nwunye ya bụ Patricia Anenih nakwa otu nwa ya nwoke bụ Eugene Anenih nwụrụ n’ọnwa Mee nakwa ọnwa Epreelu.

4. Anenih bụ aka na-achịkọta ọsọ ọkwa onyeisiala nke Olusegun Obasanjo zọrọ n’afọ 1999 nakwa afọ 2003.
5. E boro ya ebubo mpụ ego ruru ijere naira narị atọ mgbe ọ nọ n’ọkwa n’okpuru Olusegun Obasanjo.

Continue Reading

Igbo

Asusu Igbo : Buhari – Ndị na-akọ maka asambodo enweghị akaọrụ

Published

on

Ụlọọrụ onyeisiala akatọọla PDP maka ị sị na Buhari ga-egosinata asambodo ya.

Ha  agwala ndị na-esi onwu maka iwepụta asambodo Muhammadụ Buhari ka ha  ga gbara ọgwụ ha ṅụọ.
Odeakwụkwọ mgbasa ozi Onyeisiala Buhari bụ Femi Adesina kpọrọ ndị na-eme out a  ndị ọnọnkịtị enwe efe.

Continue Reading

Igbo

Asusu Igbo : Google echetala dọkịta Stella Adadevoh

Published

on

Ụlọọrụ Google echetela dọkịta Stella Adedevoh bụ onye nwụrụ dịka ọ na agba mbọ igbochi ọrịa Ebola ifesasị n’ala Naịjirịa n’afọ 2014.
Taa bụ ncheta ọmụmụ Adadevoh gbara n’afọ iri isii na abụọ.

 

Continue Reading

Igbo

Asusu Igbo : Nnamdi Kanu – Ihe gbara ọkpụrụkpụ n’okwu ya

Published

on

Onye ndu IPOB Nnamdi Kanu mere mgbasa ozi nke abụọ ya n’igwe Redio taa kamgbe ọ pụtagharịrị ihe ọzọ.
Na mgbasa ozi a bụ nke ọ malitere site na ị nabata ndị otu IPOB na ndị ọzọ na-ege ya ntị.

O kelere onye bụbu minista ụgbọelu bụ Fani Kayode na onye bụbu gọvanọ Ekiti Steeti bụ Ayodele Fayose na mbọ ha na-agba n’ikwupụta uche ha na Naịjirịa.
Nnamdị Kanu n’okwu ya sị na ọ bụ ihe pụrụiche ị bụ onye Biafra karịsịa onye otu IPOB ma too ndị nille ka nwere ntụkwasị obi n’ebe ọ nọ.
O kwuru na onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari anwụọla kamgbe ihe karịrị otu afọ na onye na-anọchi anya ya ugbua bụ onye akpọrọ Jubril si na mba Sudan.

Ọ gara n’ihe kwuo na ọ ga-eme emume n’ọnwa ọzọ bụ ebe ọ ga-egosi onyonyo ga-ekpuhe eziokwu banyere ọnwụ Buhari na nnọchi Jubril.
Kanu boro ndị gọvanọ mpaghara ọwụwanyanwụ na Ohanaeze Ndigbo ebubo na ha kpara nkata ka e gbuo ya na ndị otu IPOB.
Kanu kwuru na ya ndị ndị gọvanọ ọwụwanyanwụ kwesiri inwe mkparịta ụka n’ime ọnwa Seputemba ahụ awakporo ụlọ ya.

Nnamdi Kanu kwuru na ihe Dave Umahi gwara BBC Igbo bụ eziokwu, o kwuru na ọ gwara Umahi gaa wetara ya ihe n’Abuja mana ọ gbara aka lọta.
O kwuru na ihe ndị ndu mpaghara ọwụwanyanwụ maara bụ naanị akpa ha karịa ọ dị mma ndị Igbo.
Kanu kwuru na ọ bụ onye akpọrọ Ango Abdulahi na ndị Fulani ndị ọzọ magidere ndị ndu ọwụwanyanwụ ka ha machie IPOB.

Ọ gara n’ihu katọọ nwụchi anwụchiri ndị ụmụnwaanyị IPOB n’Owerri na onweghi onye nwere ike ikwu okwu n’ala Igbo banyere nke a.
Kanu kwuru na Ohanaeze ndigbo ga-anọ na “mmachi” gọọmentị etiti nyere ha dịka ndị ohu nke bụ na ha enweghi ihe ọbụla ha ga-emeli na Naịjirịa.
Kanu katọrọ gọọmentị Naịjirịa maka nnupuisi n’iwu na-achị obodo bụ nke o kwuru pụtara ihe n’ọchịchị dị ugbua.
O kwuru na ndị ọchịchị Naịjirịa chọrọ imechi ihe niile gbasara IPOB na nwereonwe Biafra site n’ụzọ ịkpachi ego na ihe ndị ọzọ.
N’ikpeazụ Kanu kwuru na IPOB ka kwụsi ike na agaghị enwe ntuliaka ọbụla na mpaghara ọwụwanyanwụ n’afọ 2019.

Continue Reading

Igbo

Asusu Igbo : Zigara INEC aha (Ogo m Nwoke) Uche Nwosu – Okorocha

Published

on

Gọvanọ Imo steeti bụ Rochas Okorocha agwala onyeisioche Pati APC bụ Adams Oshiomle ka o zigara INEC aha ọgọ ya nwoke bụ Uche Nwosu dịka onye ga-eji aha pati ahụ azọ ọkwa gọvanọ n’afọ 2019.
Okorocha kwuru na ọ bụ naanị nke a ga-egosi ugwu Oshiomole nwere dịka onye ama ama n’ime udo.

 

 

Continue Reading

Advertise with Us

Advertise your organization’s announcements and opportunities in enterNigeria’s daily email. Special rates for long-term buys. Email enternigeria@enternigeria.com for details.

 

Announcements, Arts & Books

Obiano Wins Nigeria Presidency Award As Most Outstanding Governor On Workers Welfare

Akpokue Global : The Most Outstanding Governor On Workers Welfare ,labour friendly policies, prompt payment of wages and salaries, as well as commitment to human capital development. Congratulations , His Excellency .

 

Winning Thursday with Michael Ebia : The Young Netpreneur for the Week

Winning Thursday with Michael Ebia

The Young Netpreneur

The Young Netpreneur for the Week is Michael Ebia , a graduate of Computer Science ,University of Benin and (MSc) Marketing , University of Salford UK , is CEO & Co-founder at ADE Digital a leading digital agency and product development company in Africa.

 

 

 

Sport1 day ago

Anambra Optimistic Of Successful Outing At National Sports Festival Abuja

Home1 day ago

Nigeria Names Fifth Commander in Under 2 Years To Lead Fight Against Boko Haram

Home1 day ago

Diezani Alison-Madueke to be extradited from UK—EFCC

Home1 day ago

Nigerian Army redeploys 103 senior officers

Business1 day ago

Nigerian court adjourns case between MTN and attorney general to Dec. 3

Special Report/Investigation1 day ago

Okowa Calls For Review Of Law Establishing TETFUND

Home2 days ago

‘You can’t be Vice President’ – El-Rufai hits Peter Obi again

Home2 days ago

GLITZ, ENCOMIUM AS EZE CHUKWUEMEKA ERI CONFERS CHIEFTAINCY TITLE (ADAERI N’IDUU ERI) ON CHIEF HON. UJU EDOCHIE.

Politics2 days ago

Araraume in trouble as INEC names Amuchie as Imo APGA Gov. Candidate.

Special Report/Investigation3 days ago

THE ANAMBRA STATE HON COMMISSIONER FOR WORKS, CHIEF ENGR. MARCEL IFEJIOFOR BAGS NSE’s PROFESSIONAL FELLOWSHIP AWARD

Politics3 days ago

There Was a Party: Who Has Jazzed APC

Home3 days ago

Prince Charles bypassing Jos ‘robbed Nigeria’s Christians of opportunity to create awareness about our travails’

Home3 days ago

El-Rufai calls Atiku’s running mate, Peter Obi a tribal bigot

Politics3 days ago

Breaking: INEC publishes Senator Uzodimma’s name as Imo APC guber candidate

Home3 days ago

The World Bank confirms Obiano’s strides in governance

Special Report/Investigation3 days ago

Peter Obi, Ghost Of The Past And Reality Of Today

Politics3 days ago

INEC Releases List Of Governorship, House Of Assembly Candidates

Business3 days ago

First bank launches WhatsApp banking

Parliament3 days ago

Laws can help fight terrorism in Africa- Senate President

Life & Style3 days ago

Nigerian Leader seeks revival of textile industry

Home3 weeks ago

Northern group to Atiku: Drop Obi or forget 2019

Home3 weeks ago

DSS Denies Facilitating Kanu’s Escape from Nigeria

Home4 weeks ago

ANAMBRA STATE COMMISSIONER FOR WORKS BAGS AWARD AS AN ICON OF INFRASTRUCTURAL DEVELOPMENT

Home1 week ago

APGA primaries: Oye urges aggrieved members to forgive party’s mistakes

Home2 weeks ago

News Pictures Of The Day : Obiano visits Ooni of Ife, wife

Home3 weeks ago

British govt informs Nigeria of plans to issue travel document to Kanu –Source

Home4 weeks ago

Chinua Achebe : There was a Country- A Review

Home2 days ago

‘You can’t be Vice President’ – El-Rufai hits Peter Obi again

Home3 weeks ago

APGA sets up reconciliation committee

Home4 weeks ago

No travel ban list: Presidency

Business2 weeks ago

Billionaire Atiku declares paltry N20m yearly income

Home3 days ago

El-Rufai calls Atiku’s running mate, Peter Obi a tribal bigot

Politics3 weeks ago

THE ROAD TO JUSTICE : THANK YOU COMMUNITY TOUR OF ANAMBRA SOUTH By Ambassador Bianca Odumegwu-Ojukwu.

Home2 weeks ago

Breaking: Ex-PDP BOT chairman, Tony Anenih, dies in Abuja

Home1 week ago

Just In: Labour Suspends nationwide strike

Special Report/Investigation2 weeks ago

FG Charges Senators Uzodinma, Oduah Over Non-Declaration Of Assets

Home2 weeks ago

How to Restructure Nigeria: Why, What, How and When

Home4 weeks ago

Buhari Gets Approval On Paris Club Debt Settlement

Home3 weeks ago

Chimamanda calls Melania Trump racist

Home1 week ago

Charles’ trip to Nigerian city of Jos cancelled after plans disrupted

Advertisement
October 2018
S M T W T F S
« Sep   Nov »
 123456
78910111213
14151617181920
21222324252627
28293031  

Trending