Igbo
Nnamdi Kanu: Abaribe na ndị ọzọ a ga-akwụnye ụlọikpe nde narị naira(N100m)?

Akụkọ na-eru anyị ntị site n’ụlọikpe ukwu di n’Abuja na-akọwa na ọkaikpe Binta Nyako enyela iwu ka ego Sịnetọ Eyinnaya Abaribe na mmadụ abụọ ọzọ jiri gbara Nnamdi Kanu aka ebe baa n’akpa ụlọikpe.
Ọkaikpe Nyako nyere iwu a iji megharị usoro oji nye Nnamdi Kanu n’aka Abaribe na mmadụ abụọ ọzọ n’ọnwa Eprelụ nke 2017.
Mgbe ahụ, Abaribe, Tochukwu Uchendu na Immauel Shalom ji akwụkwọ akụnaụba ha nara Maazị Kanu n’aka ụlọikpe.
Ugbua, Ọkaikpe Nyako sị ka ha kwụnye nde narị naira (100 million) n’ụlọakụ ụlọikpe.
BBC gbara otu onye metụtara Abaribe ajụjụ ọnụ maka mkpebi a, o were sị na onweghi ihe ngbagwojuanya dị na ya maka na ikpe ka na-aga n’ihu.
“Anyị aghaghị itinye ọnụ n’okwu a karịa ikwu na ikpe ka na-aga n’ihu. Ọ bụ ubọchị 28 nke Mach 2019 ka a ga-alaghachi ụlọikpe maka ya a.”
Ọkaikpe Nyako kwuru na ọbụghị Abaribe na ndị ọzọ a ka ọ na-ekpe ikpe.
“Ihe m chọrọ bụ ka ha kpọpụtara m Nnamdi Kanu,” Nyako kwuru mgbe ọ kpere ikpe taa.
Iwu ya bụ na Abaribe na mmadụ abụọ a nwere ọnwa abụọ iji kwunye ego a.
Cheta na ebidoro ịchọ Kanu ka ndi agha Naịjirịa na ụfọdụ ndị na-akwado ya kwakọrọ isi na be ya n’afọ 2017.
Ndị Ipob, bu otu Kanu nọ n’isi ha, kwuru na mmadụ 28 nwụru mgbe ndị agha wakporo be ya. Ndị agha kwuru na nke a abụghi eziokwu.
Kanu n’onwe ya sị na ọ bụ egwu na ndi agha ga egbu ya mere ojiri gbaa ọsọ.
Ọ sị na ya nọ Izrel ugbua, ma kwukwa na ya chọrọ ịlọta bịa zara ọnụ n’aka Binta Nyako, “ma ọ ọbụru na mba ụwa ga-ekwe nkwa na ikpe m ga akwu ọtọ”.
Igbo
Mmadụ asaa anwụọla n’ọkụ tanka gbara n’Anambra

Mmadụ asaa n’ime mmadụ asatọ anwụọla ka ọkụ tanka gbara n’Amawbia dị n’Awka.
Haruna Mohammed bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na Anambra state kwuru na ọkụ a gbara ụgbọala ruru asatọ ma mebie ụlọ na ụlọ ahịa ha agụtabeghị ọnụ.
O kwuru na ebugala otu onye ka dị ndụ n’ime ndị ọkụ tanka a gbara n’ụlọ “Nnewi Teaching Hospital”.
Haruna kwuru na ya na ndị otu ya nọ na-akwalisi ihu ebe ihe a mere ka ụzọ were gara ndị ọzọ were were.
Igbo
Asusu Igbo EFCC: Ụmụ T.A. Orji ka anyị na-enyocha

Ọnụ na-ekwuru EFCC bụ Tony Orilade ewepụtala akwụkwọ ozi na-ekwu na ọbụghị na-ezie na ha na-achọ ụmụ Atiku Abubakar bụ onye ji aha PDP azọ ọkwa onyeisiala.
EFCC sị na ọtụtụ mmadụ na-ajụ ha ajụjụ ịmata ma onwere ka ha sị jide ụmụ Atiku Abubakar ịchọ ma o nwere ego mba ofesi ha ji ike dị.
N’okwu a, “nke bụ akụkọ na egwu. Onweghi eziokwu tọgbọ n’ime ya”.
Ha kwukwara na-ọtụtụ mmadụ amarala n’ụlọọrụ EFCC na-enyocha aka chiburu Abia Steeti bụ Theodore Orji bụ nke a na-ebo ebubo buuru ọkpụrụkpụ ego dị ijeri naịra iri abụọ na asaa (N27b).
Okwuru na, “Ka anyị na-eme nnyocha a, anyị chọpụtara na ụfọdụ ego ndị ahụ sị ụmụ ya n’aka gafee”.
EFCC na-enyocha ọtụtụ ihe ọdị ha ka ha eji ego ndị a zụta nke gụnyere ụgbọala.
“Fraịde gara aga anyị chụrụ otu n’ime ugboala ruo n’ụlọ oriri na nkwari dị n’Abuja”, dịka ha dere na-akwụkwọ a.
Ha sị na ha mechere kpụrụ Ogbonna Orji gbara afọ 32 bụ onye bu ụgbọla Range Rover a na-ere otu nde narị naịra (N100 m) na ogbo ya bụ Kelvin Ilonah bụ onye bukwa ụgbọla Range Rover a na-ere nde iri atọ na ise (N35 m).
Ka ha na-agba mmadụ abụọ a ajụjụ ọnụ ka ha kpọgara ha ebe ha bi bụ ebe ha na-akwụ ego dị nde naịra iri na atọ (N13 m) kwa afọ.
Ha chọpụtakwara ụgbọla ọzọ bụ Prado Jeep 2017 bụ nke dị n’ebe ha.
EFCC sị na mmadụ abụọ gbakwara ama nke na-enyere ha aka na nchọpụta ndị ọzọ.
Akwụkwọ ahụ dere na, “Ụmụ Atiku esoghị ndị ejidere”.
Ndị ụlọọrụ ahụ jikwa ohere ahụ gọrọ aka ha n’ebubo eboro ha izu gara aga maka ịkpọchị ọbaego Peter Obi.
Ha sịkwa na-eziokwu atọgbọghị na nka ma ọlị.
Igbo
Jubril: Anwụghị m anwụ, a ka kwụm chịm – Buhari

Onyeisiala Naịjirịa bụ Mohammadụ Buhari azarala ọnụ ya n’ebubo Nnamdi Kanu boro ya na ọ nwụọla kamgbe afọ 2017.
Buhari katọọrọ ebubo a site n’okwu o kwuru mgbe ya na ndị Naịjirịa bi na obodo Krakow nke mba Poland na-akparị ụka.
JUST IN: "A lot of people hoped that I died during my ill health. It is real me… I will soon celebrate my 76th birthday and I will still go strong.” — President @MBuhari this evening in Kraków, Poland. His response to a question of him being cloned. pic.twitter.com/JL9QfUF3PL
— Bashir Ahmad (@BashirAhmaad) December 2, 2018
Onye enyemaka ya pụrụiche na mgbasaozi ọgbara ọhụrụ bụ Bashir Ahmad depụtara nke n’akara twitter ya;
Buhari kwuru “Ọtụtụ ndị chere na m nwụrụ n’oge m na-arịa ọrịa. Ihe a bụ mụ n’ezie.”
“Aga m eme emume ncheta afọ iri asaa na isii nke ọ mụmụ m. M ka ga-adị ike.”
Igbo
#IgboNews – Ị ma ụmụnwaanyị ji ndị Super Eagles n’ọrụ?

Ọtụtụ ndị Naịjirịa nwere ntụkwasị obi na ndị na-agbara otu egwu Naịjirịa bụ Super Eagles bọọlụ, mana kedụ ndị bụ ndị nkwado ha oge ha na-anọghị n’ọdọ egwuregwu?
Ka onye ọbụla na-etinye anya n’ihe gbasara ndị otu Super Eagles, e nwere ndị ha debere n’ụlọ na-akwado ha n’asọmpi ma na-ele anya mgbe ha ga-alọta ka ha nwee ike nọkọọ.
Ndị ahụ bụ nwunye ha na ndị enyi ha nwaanyị.
Ndị a bụ ndị na-agba ha ume ma ọ dị mma ma ọ dị njọ.
Anyi ga-egosi gị ndị a dị mkpa na ndụ ndị Super Eagles.
Ndị ochee goolu
1) Ikechukwu Ezenwa
Ochee goolu Ikechukwu Ezenwa lụrụ nwunye ya bụ Amaka n’afọ 2013. Ha amụtala ụmụ nwoke atọ.
2) Daniel Akpeyi
Akpeyi bụ ochee goolu ndị Super Eagles lụrụ nwunye ya bụ Emmanuella n’afọ 2016.
Ndị na-agba n’azụ:
3) William Troost-Ekong
Troost-Ekong na-ejidere ndị Super Eagles azụ, na enyi ya nwaanyị ayịruola afọ anọ. Enyi ya nwaanyị dị ime nwa ga-abụ nwa mbụ ha.
4) Kenneth Omeruo
Omeruo na-agbara ndị Super Eagles n’azụ, lụrụ nwunye ya bụ Chioma n’ọnwa Mee 2018.
5) Chidozie Awaziem
Chidozie bidoro ịgbara Naịjirịa bọọlụ na 2017. Lee foto ya na enyi ya nwaanyị bụ Obiageli.
6) Elderson Echiejile
Echiejile lụrụ nwunye ya bụ Oghenevwemo n’afọ 2017. Ha mụrụ nwa ha nke mbụ n’ọnwa Maachị 2018.
Ndị egwu etiti
7) John Mikel Obi
Mikel na enyi ya nwaanyị bụ Olga Diyachenko ayịruola ihe ruru afọ ise. Ha mụrụ ụmụnwaanyị abụọ bụ ejima.
8) Onazi Ogenyi
Onazi lụrụ nwunye ya bụ Sandra n’afọ 2015. Ha amụtala otu nwa nwaanyị.
9) Wilfred Ndidi
Ndidi bidoro ịgbara Super Eagles n’afọ 2015. Ya na enyi ya nwaanyị bụ Chidinma ayịruola afọ abụọ.
10) Oghenekaro Etebo
Etebo bidoro ịgbara Naịjirịa n’afọ 2013. Ya na nwunye ya bụ Isi Ebhota amụtala otu nwa nwoke.
11) Joel Obi
Obi bidoro ịgbara Super Eagles n’afọ 2011. Ya na enyi ya nwaanyị amụtala otu nwa nwoke.
Ndị na-agba n’ihu
12) Odion Ighalo
Ighalo na nwunye ya bụ Sonia, alụọla ọtụtụ afọ. Ha mụtara ụmụ atọ bụ nwoke abụọ na otu nwaanyị.
13) Ahmed Musa
Musa lụrụ Juliet n’afọ 2017 ka ya na nwunye ya nke mbụ na nne ụmụ ya abụọ bụ Jamila gbasara.
14)Victor Moses
Moses lụrụ nwunye ya bụ Josephine n’afọ 2017. Agbamakwụkwọ ya na-abịa ka ha mụchara ụmụ abụọ, otu nwoke nke a mụrụ n’afọ 2012 na nke nwaanyị a mụrụ n’afọ 2015.
Proud moment for me celebrating winning the Premier League with my family #blessed pic.twitter.com/c1abpX7wrt
— Victor Moses (@VictorMoses) May 23, 2017
Kedụ ndị ọzọ ị ma ụmụnwaanyị nọ na ndụ ha?
Igbo
Asusu Igbo : Ihe ise ị kwesịrị ịma maka Alvan Ikoku

Ụbọchị 18 nke ọnwa Nọvemba 2018, ga-eme ya afọ 47 Alvan Ikoku nwụrụ, mana kedụ ihe ị ma maka ya?
Alvan Ikoku so na ndị Igbo ji eme ọnụ, ya bụ ndị ọ ga-abụ akpọwa aha ndị Igbo bụ isi a hụrụ kwaba okpu ghara ịkpọ aha ya, a mara na ihe emebiela.
Nke a mere anyi ji chọọ icheta nwoke a n’ụbọchị ọ nwụrụ n’afọ 47 gara aga.
Lee ihe ndị ị kwesịrị ịma maka ya:
– A mụrụ ya n’afọ 1900, n’Amanagwu dị n’Arọchukwu dị n’Abịa steeti.
-Ya na Akanu Ibiam bụbu gọvanọ ebe a ma dịka “Eastern Region”, gakọrọ ụlọakwụkwọ “Hope Waddell Training Institution” otu oge. Ka ọ na-agụcha ka Nnamdi Azikiwe banyere ịgụ nke ya n’otu ebe ahụ.
-O kuzitere ọnụ ya na nkuzi, nke mere e ji ziga ya na mịnịstrị na-ahụ maka agụmakwụkwọ n’afọ 1946 ka ọ banyere n’ụlọomeiwu nke “Mpaghara ọwụwa-anyanwụ”. Nke a mere ka ọ bụrụ otu n’ime naanị ndị na-anọchite anya ọwụwa-anyanwụ atọ nọ n’ụlọomeiwu oge ahụ.
-O hibere ụlọakwụkwọ “Aggrey Memorial Secondary” n’Arọchukwu.
-E ji maka mbọ niile ọ gbara oge ọ na-arụrụ gọọmentị na ngalaba agụmakwụkwọ, hibe ụlọakwụkwọ “Alvan Ikoku Federal College of Education”, otu okporoụzọ dị na Maitama n’Abuja nakwa tinye ihu ya n’elu N10, ka e ji na-echeta ya.
Igbo
Asusu Igbo : A mịpụla ego ọzọ n’akpa NLNG – Sineti.

Ụlọomeiwu ukwu bụ Sineti ekwuola na ha achọpụtala ego dị otu ijeri dọla ndị ụlọọrụ NNPC mịpụrụ site n’akpaego ụlọọrụ na-ahụ maka mmanụ gaasị bụ NLNG.
Onyeisi Otu mere nyocha ahụ bụ Bassey Albert Akpan agwala ndị NNPC na CBN ka ha gosi akwụkwọ eji mịpụ ego ahụ.
Igbo
Asusu Igbo :Buhari Waec Certificate: Onyeisiala anatala asambodo ya

And… #BuhariCertificate!
?? ✈️ ? pic.twitter.com/1tc9RrTqnN
— Bashir Ahmad (@BashirAhmaad) November 2, 2018
Onye Ose foto Buhari bụ Bayo Omoboriowo, wepụtara foto gosiri ka Buhari natara asambodo ọhụrụ ngalaba na-ahụ maka ule na West Afrịka bụ Waec nyere ya.
Nke bụ na Waec etinyela mmechi n’akụkọ banyere ma Buhari onwere asambodo etu o si kwuo na o nwere.
IN CASE YOU DON’T KNOW; just as President @MBuhari did, you can also obtain “Attestation of Results” from @WAECNigeria. Lost your certificate? Submit your two recent passport photographs and pay N20,000 in draft, WAEC will do the rest for you. #BuhariCertificate pic.twitter.com/HixrDG8L42
— Bashir Ahmad (@BashirAhmaad) November 2, 2018
Buhari kwukwara sị na ọ bụ ya na Shehu Musa Yar’Adua nwụrụ anwụ gakọrọ otu ụlọakwụkwọ ma na praịmarị ma na sekọndrị ma sorokwa banye ọzụzụ ndị agha otu oge.
Today I received the attestation and confirmation of my 1961 West African School Certificate (WASC) Examination result, from the Registrar of the West African Examinations Council (WAEC). It was also an opportunity for me to thank WAEC for upholding its integrity over the years. pic.twitter.com/coJpMFZ0Kr
— Muhammadu Buhari (@MBuhari) November 2, 2018
O kwuru na ya na Yar’Adua lere ule Waec n’afọ 1961.
Otu n’ime ọnụ na-ekwuchitere Buhari bụ Bashir Ahmed tinyere ihe nkiri gosiri ka Buhari na-anata asambodo ya ebe n’elu Twitter:
VIDEO: President Muhammadu Buhari has today at the State House, Abuja, received the attestation and confirmation of his 1961 West African School Certificate (WASC) Examination result, from the Registrar of the West African Examinations Council (WAEC). pic.twitter.com/HeUGbdLU38
— Bashir Ahmad (@BashirAhmaad) November 2, 2018
Igbo
Gịnị mere ụfọdụ ụmụnwoke ji ‘alụ’ nwabebi?

Ọ bughi ịhe ọhụrụ na ụfọdụ ụmụnwoke na-ejizi nwabebi eme enyi, kama ihe mgbawoju anya bụ etu ha si azụta ya n’agbanyeghi na ọ dara ọnụ.
Nwoke akpọrọ “Pretty Mike of Lagos” zụtara nwa bebi dịka onyinye o nyere onwe ya n’ụbọchị ncheta ọmụmụ ya.
Kamgbe o wepụtachara foto gosiri ebe ya na nwabebi nọ, ndị mmadụ nọ soshal midia etinyela ọnụ n’okwu ahụ.
Cheta na n’ọnwa Mee nke afọ a, otu otiegwu akpọrọ Shuga Shaa bụ onye Delta steeti kwuru na ọ zụtara nwabebi ya n’ọnụ otu nde naira (N1,000,000).
Ọ zutaara ya ụgboala ma kpọrọ ya na-aga ụlọ ihe nkiri.
Etu o si kwụrụ ugbua, “Pretty Mike of Lagos” depụtara n’elu soshal midia na “ndị mmadụ na-ahụ nwabebi dịka nke e ji enwe mmekọrịta mana mụ onwe m na-ahụ ya dịka onye nkasiobi, onye na-anọkete m
nakwa onye na-agaghị agbaghapụ m.”
Igbo
Asusu Igbo: Imo APC Primaries: Ụwa gbara onye ọbụla gharị

Echi bụ ụbọchị ikpeazụ INEC wepụtara maka ịnye ha aha ndị ga-ebụ ọkọrọtọ ndị pati nịịle nọ na Naịjịrịa bụ ndị ga-anọchite anya ha na ndọrọndọrọ ọchịchị 2019 dịka gọvano maọbụ ndi ọmeiwu.
Ka ọ dị ugbua onwebeghị onye ma ihe echi ga-eweta n’APC Imo steeti dịka ihe siri kwuru.
Ikpe ka dị n’ụlọikpe na etiti Uche Nwosu na Hope Uzodinma maka onye ga-ebutere APC ọkọrọtọ gọvanọ n’Imo steeti.
Chetakwa n’ụlọikpe yighariri ụbọchị ya bụ Ikpe mgbe amaghị ama, dịka ndị otu Rochas Okorocha na-arịọ ụlọikpe ukwu n’Abuja nke Justice Ishaq bello nọ n’isi ya ka ha kagbuo mkpebi ọkaikpe Othman Musa nke si na ọ bụ Hope Uzodimma meriri ya bụ ntuliaka APC n’Imo steeti.
Nke meburu mbụ bụ na okwu onyeisioche pati nọ n’ọchịchị bụ All Progressives Congress (APC) bụ Adams Oshiomhole kwuru banyere ntuliaka imeụlọ ndị APC mere n’Imo steeti mere ka ọ bụrụ na isi niile ndị mmadụ nyara na ntuliaka imeụlọ nke mbụ bụ n’efu.
Oshiomhole gara n’ihu kwuo na akwukwo abụọ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị Imo na-ewogharị na soshal media abụghị eziokwu.
Okwu a pụtara na Uche Nwosu, bụ ọgọ aka na-achị Imo steeti Rochas Okorocha, na Hope Uzodimma, bu onye bụ Sineto na-anọchịte anya Orlu zone n’Ụlọ Omeiwu nke Naịjirịa enweghị mmeri dịka ndị nkwado ha kwuru ụnyaahụ.
Cheta na akwụkwọ ndị oke APC nke na-ekweghị na nwepụta Rochas wopụtara Uche Nwosu wepụtara akwụkwọ gosiri na Hope Uzodimma ji vootu 423,895 merie ntuliaka ahụ. Onye binyere aka na ya bụ akwụkwọ bụ onye isi ndị APC bịara nhazi ntuliaka a bụ Ahmed Gulak.
N’aka ọzọ, Onye ode akwụkwọ mgbasa ozi APC n’Imo bụ Jones Onwuasoanya kwuru si na ọ bụ Uche Nwosu merịrị.
Ọ gakwara n’ihu zitere anyị akwụkwọ onye ode akwụkwọ ndị kọmiti a binyere aka. Akwụkwọ a gosiri na Uche Nwosu meriri.
Nke bụ na tupu Oshiomhole jiri kagbuo ntuliaka, mmadu abụọ no ka ndị a sị meriri dịka ndị ga-azọ vootu na afọ 2019 dịka gọvanọ n’okpuru APC n’Imo steeti.
Ọtụtụ mmadu ndị a gbara ajụju ọnụ kwuru na ihe mere ntuliaka jiri dị ọkụ n’Imo ha were kwuo na ọ bụ maka ọtụtụ mmadụ chọrọ ohere ịchị Imo.
N’ime ha, Hope Uzodimma bụ onye Orlu Zone, bụ ebe ọtụtụ ndi chiri Imo na mbụ si. Gọvanọ Okorocha bụkwa onye Orlu zone.
Uche Nwosu bụ onye Umuokwe, Eziama-Obaire n’okpuru ọchịchị Nkwerre, nke sokwa n’ebe akpọro Ọrlụ Senatorial Zone na Bekee. Nke mere ka ọtụtụ mmadu na-ekwu na ebe Okorocha bụ ọgọ ya nwoke, ọ pụtara na ọchịchi ya ga-abu ndọtị nke Okorocha, dika Bekee na-akpọ ‘term’ ọzọ Okorocha nakwa Orlu Zone.
Eze Madumere bụ osote aka na-achị Imo, ma bụkwara otu n’ime ndị na-azọ ọkwa govanọ na steeti ahụ. Madumere bụ onye gburugburu Owere, bu ebe si na ọkwa rụru ha makana kemgbe ọchịchi onye kwuo uche ya nke mpaghara batara n’afọ 1999, ha enwebeghi nwa ha chịri steeti ahụ.
Atụmatụ ya ịzọ ọkwa gọvanọ so n’ihe tisara adụ na mma ya na Okorocha.
Madumere kwuru na ọbụghị makana ya ezughi ịchịta Imo mere Okorocha ejighi akwado ya.
Ndị ọzọ so zọọ ya bụ oche bụchakwa ndị metụtara Okorocha, dịka onye rụrụ ọrụ dịka onye odeakwụkwọ gọọmentị Imo steeti bụ George Etche na ogbo ya n’ọrụ gọọmentị Imo bu Jude Ejiogu.
Chima Anozie, Peter Gbuje, Chris Nzemoka na Chuks Ololo sokwa zọọ ya bụ ohere ịtụrụ ugo APC.
Igbo
Asusu Igbo : Aga m akwụsị ndị mba ọzọ amụrụ n’Amerịka ị bụ ndị mba anyị – Trump

Nwa mba ọzọ amụrụ na Amerịka agaghị abụzị nwafọ Amerịka .
Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump aṅụọla iyi na ọ ga-akwụsị ikike iwu kwuru na nwa ndị mba ọzọ a mụrụ na Amerịka ga-abụ nwafọ mba Amerịka.
Ọ gbarụrụ ihu na ọ bụ naanị Amerịka ka ụdị iwu a dị ire, ma kwuo na ọ ga-agbanwe iwu a ma ọ bụrụ na ndị ọchịchị tinyere aka n’akwụkwọ.
Trump kwuru na nke dị mkpa maka ibelata ọnụọgụgụ ndị mmadụ na-abata n’Amerịka kwa mgbe.
-
Home4 weeks ago
US think tank cancels ‘conversation’ with Peter Obi
-
Home2 weeks ago
Idigo Dynasty Aguleri Announces Royal Passage Of Igwe Christopher Idigo
-
Home4 weeks ago
Governor Obiano makes Case for National Day in Honour of Zik
-
Home3 weeks ago
Anambra Govt Restates Stand Against Communique On Ime Obi Ohaneze Meeting At Enugu
-
Home3 weeks ago
Nigeria’s Senate for emergency session over top judge’s ouster
-
Home2 weeks ago
Appreciating Osodieme’s Crusade for Women Empowerment
-
Home3 weeks ago
Nnia Nwodo and the Sensitivity Test
-
Home2 weeks ago
Wife ‘chops off husband’s penis after beating him to death with frying pan’
-
Home4 weeks ago
INEC Rejects Ezekwesili’s Withdrawal From Presidential Race
-
Home4 weeks ago
PRESIDENT BUHARI RECEIVES IN SPECIAL AUDIENCE HIS STAFF AS MILITARY HEAD OF STATE AT THE STATE HOUSE
-
Home4 weeks ago
South-East Governors Forum Warns Mischief Markers To Steer Clear Of Zone
-
Home4 weeks ago
BLESSED IWENE TANSI : HOLY! HOLY! HOLY!! AS CATHOLIC PRIESTS STORM AGULERI.
-
Sport4 weeks ago
Army, Police, 1,576 Teams To Participate In 2019 Anambra Football Season
-
Life & Style4 weeks ago
Florence Nwapa: The Mother Of African Literature
-
Home2 weeks ago
Obiano, APGA National Leader, Not A Defector
-
Special Report/Investigation4 weeks ago
Why South East is facing unstable power supply — EEDC
-
Home2 weeks ago
No state like anambra in four years
-
Life & Style3 weeks ago
Black Panther cast and crew react to Oscar nominations
-
Home4 weeks ago
PRESS STATEMENT BY APC PRESIDENTIAL CAMPAIGN COUNCIL ON ATIKU’S CLANDESTINE VISIT TO THE U.S
-
Business4 weeks ago
Genevieve Nnaji, Lola Shoneyin, Uzoamaka Aduba, others make AWP Network Power List