Connect with us
 

Igbo

Asusu Igbo EFCC: Ụmụ T.A. Orji ka anyị na-enyocha

Published

on

Ọnụ na-ekwuru EFCC bụ Tony Orilade ewepụtala akwụkwọ ozi na-ekwu na ọbụghị na-ezie na ha na-achọ ụmụ Atiku Abubakar bụ onye ji aha PDP azọ ọkwa onyeisiala.
EFCC sị na ọtụtụ mmadụ na-ajụ ha ajụjụ ịmata ma onwere ka ha sị jide ụmụ Atiku Abubakar ịchọ ma o nwere ego mba ofesi ha ji ike dị.

N’okwu a, “nke bụ akụkọ na egwu. Onweghi eziokwu tọgbọ n’ime ya”.
Ha kwukwara na-ọtụtụ mmadụ amarala n’ụlọọrụ EFCC na-enyocha aka chiburu Abia Steeti bụ Theodore Orji bụ nke a na-ebo ebubo buuru ọkpụrụkpụ ego dị ijeri naịra iri abụọ na asaa (N27b).
Okwuru na, “Ka anyị na-eme nnyocha a, anyị chọpụtara na ụfọdụ ego ndị ahụ sị ụmụ ya n’aka gafee”.
EFCC na-enyocha ọtụtụ ihe ọdị ha ka ha eji ego ndị a zụta nke gụnyere ụgbọala.
“Fraịde gara aga anyị chụrụ otu n’ime ugboala ruo n’ụlọ oriri na nkwari dị n’Abuja”, dịka ha dere na-akwụkwọ a.
Ha sị na ha mechere kpụrụ Ogbonna Orji gbara afọ 32 bụ onye bu ụgbọla Range Rover a na-ere otu nde narị naịra (N100 m) na ogbo ya bụ Kelvin Ilonah bụ onye bukwa ụgbọla Range Rover a na-ere nde iri atọ na ise (N35 m).
Ka ha na-agba mmadụ abụọ a ajụjụ ọnụ ka ha kpọgara ha ebe ha bi bụ ebe ha na-akwụ ego dị nde naịra iri na atọ (N13 m) kwa afọ.
Ha chọpụtakwara ụgbọla ọzọ bụ Prado Jeep 2017 bụ nke dị n’ebe ha.
EFCC sị na mmadụ abụọ gbakwara ama nke na-enyere ha aka na nchọpụta ndị ọzọ.
Akwụkwọ ahụ dere na, “Ụmụ Atiku esoghị ndị ejidere”.
Ndị ụlọọrụ ahụ jikwa ohere ahụ gọrọ aka ha n’ebubo eboro ha izu gara aga maka ịkpọchị ọbaego Peter Obi.
Ha sịkwa na-eziokwu atọgbọghị na nka ma ọlị.

Continue Reading
Advertisement

Igbo

Ash Wednesday: Kedụ ihe ịnara ntụ pụtara?

Published

on

Taa bụ ụbọchị ndị na-ekpere Kraịst n’ụwa niile na-echecta dịka ụka ụbọchị ntụ “Ash Wednesday” na Bekee.
Ọ bụ ụbọchị ndị na-eso Kraịst na-edebe dịka ụbọchị dị nsọ, ha ga-aga nara ntu n’isi, ụfọdụ na-asọkwa ịta anụ n’ụbọchị a.

Mana gịnị ka ịnara ntụ n’etiti isi pụtara?
Archbishop nke Canterbury bụ Justin Welby kwuru na ịnata ntụ bụ iji gosi ndabere anyị nwere n’amara Chineke.

Ụbọchị ntụ bụ ụbọchị mbụ n’oge Beke kpọrọ ‘Lent’ nke ndị ụka Kraịst ji echeta ahụhụ Jịsọs tara mgbe ọ nọ n’ụwa tupu ọ nwụọ, wee binyekwa.
Na ngwụcha ‘Lent’ bụ oge ‘Easter’ mgbe a ga-eme mmemme maka Jịsoso ikwulite n’ọnwụ.
Oge a kpọrọ ‘Lent’ na-eru ụbọchi iri anọ bụkwa oge ndị mmadụ ji ahapụ ụfọdụ ihe na ndụ ha iji dị ka Chineke.

Kedụ ihe iri anọ ji pụọ iche?
Dịka ụlọ ntaakụko siri kwuo ụbọchị iri anọ bụ nke dị mkpa n’ebe ndị ụka Kristi nọ.
– N’akụwkọ Jenesis, Chineke mere ka mmiri zoo n’ụbọchị iri anọ
-Ụmụ Izrel gara n’Ọzara n’afọ iri anọ tupu ha eruo ala ekwere ha na nkwa
-Moses buru ọnụ ụbọchị iri anọ tupu o nweta iwu nsọ nke Chineke nyere ya.
-Jisos nọrọ n’ịkpa ụbọchị iri anọ ebe ọ na-ebu ọnụ na akwadokwa ọrụ ya n’ụwa.
Gịnị ka ị na-agbahapụ n’ụbọchi iri anọ tupu ‘Easter’ e ruo?
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị

Continue Reading

Igbo

Ka Inec si akwado ntuliaka ọkwa gọvanọ n’ọwụwa anyanwụ

Published

on

Ụlọọrụ Inec dị n’Imo steeti amalitela ikesa ngwaọrụ a ga-eji mee ntụliaka na steeti ahụ.
Na mgbede ụbọchị isii n’ime ọnwa Maachị ka ha bidoro na-ahazi ya bụ ngwaọrụ n’usoro okpuruọchịchị dị iche iche tupu ebugawa ya ebe ahụ.

Nke a na-eme n’ụlọọrụ ụlọakụ ukwu nke Naịjirịa bụ CBN dị n’Imo steeti.

Onyeisi ụlọọrụ Inec n’Imo steeti bụ ọkammụta Chukwuemeka Ezeonu, kwuru na ha ahụla na ntuliaka nke ọkwa gọvanọ ga-ata ezigbo akpụ, ya mere ha ji akwado n’oge ka ihe gaa nkeọma ụbọchị ahụ.

Ọ gara n’ihu nyocha ngwaọrụ ndị ahụ mara ma ha ezukwara ezu.

N’Ebọnyị,
Ụnyaahụ bụ mkpụrụ ụbọchi ise nke ọnwa Maachị, ka ụlọọrụ inec kpọrọ ọgbakọ ndị ọnụ na-eru n’okwu n’Ebọnyị steeti.
Ndị pati 38 nakwa ndị otu na-abụghị nke gọọmenti bụ ndị ga-enyocha ka ya bụ ntuliaka nke a ga-eme na mkpụrụ ụbọchị itoolu nke ọnwa Maachị ga-esi gaa, bụ ndị nke dị iri (10) bịara ya bụ ọgbakọ.

Isiokwu Inec bụ na onweghi onye ọbụla ga-atụ vootu ụbọchị satọde na-ejighi igwe “smartcard reader”.

Inec sị na iwu a ga-akpụ okụ n’ọnụ n’ọgbọ a
Mgbe ndị bịara ya bụ mkparitaụka jụrụ ajụjụ si, “ọ bụrụ na “smartcard reader” arụghị ọrụ, gịnị ka a ga-eme?”, Inec zara sị na ndị ọrụ ha ga-ewete smartcard reader ọzọ were dochie nke mebiri emebi.

“Ọ bụrụ na nke ahụ ekweghi arụ ọrụ ahapụzịa ya ka ọ dịwa echi”.
Inec sị na akụrụngwa e ji arụ ọrụ ga-ahapụ ụlọọrụ ha ụbọchi Wenezde (Maachị 6) gawa ulọọrụ ha dị n’okpuruọchịchị dị icheiche, bụ ebe ha ga-esi gawa na RAC ha ụbọchị Fraịde.
Chris Onugbogu nke ulọọru Inec Ebọnyị steeti sị na “nke a ga-ewezuga ọgbatauhie pụrụ idapụta makana e mee ngwangwa, emeghara ọdachị.”

Continue Reading

Igbo

Mmadụ asaa anwụọla n’ọkụ tanka gbara n’Anambra

Published

on

Mmadụ asaa n’ime mmadụ asatọ anwụọla ka ọkụ tanka gbara n’Amawbia dị n’Awka.
Haruna Mohammed bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na Anambra state kwuru na ọkụ a gbara ụgbọala ruru asatọ ma mebie ụlọ na ụlọ ahịa ha agụtabeghị ọnụ.

 

O kwuru na ebugala otu onye ka dị ndụ n’ime ndị ọkụ tanka a gbara n’ụlọ “Nnewi Teaching Hospital”.

Haruna kwuru na ya na ndị otu ya nọ na-akwalisi ihu ebe ihe a mere ka ụzọ were gara ndị ọzọ were were.

Continue Reading

Igbo

Jubril: Anwụghị m anwụ, a ka kwụm chịm – Buhari

Published

on

Onyeisiala Naịjirịa bụ Mohammadụ Buhari azarala ọnụ ya n’ebubo Nnamdi Kanu boro ya na ọ nwụọla kamgbe afọ 2017.
Buhari katọọrọ ebubo a site n’okwu o kwuru mgbe ya na ndị Naịjirịa bi na obodo Krakow nke mba Poland na-akparị ụka.

Onye enyemaka ya pụrụiche na mgbasaozi ọgbara ọhụrụ bụ Bashir Ahmad depụtara nke n’akara twitter ya;
Buhari kwuru “Ọtụtụ ndị chere na m nwụrụ n’oge m na-arịa ọrịa. Ihe a bụ mụ n’ezie.”
“Aga m eme emume ncheta afọ iri asaa na isii nke ọ mụmụ m. M ka ga-adị ike.”

Continue Reading

Igbo

#IgboNews – Ị ma ụmụnwaanyị ji ndị Super Eagles n’ọrụ?

Published

on

Ọtụtụ ndị Naịjirịa nwere ntụkwasị obi na ndị na-agbara otu egwu Naịjirịa bụ Super Eagles bọọlụ, mana kedụ ndị bụ ndị nkwado ha oge ha na-anọghị n’ọdọ egwuregwu?
Ka onye ọbụla na-etinye anya n’ihe gbasara ndị otu Super Eagles, e nwere ndị ha debere n’ụlọ na-akwado ha n’asọmpi ma na-ele anya mgbe ha ga-alọta ka ha nwee ike nọkọọ.
Ndị ahụ bụ nwunye ha na ndị enyi ha nwaanyị.
Ndị a bụ ndị na-agba ha ume ma ọ dị mma ma ọ dị njọ.

Anyi ga-egosi gị ndị a dị mkpa na ndụ ndị Super Eagles.
Ndị ochee goolu
1) Ikechukwu Ezenwa
Ochee goolu Ikechukwu Ezenwa lụrụ nwunye ya bụ Amaka n’afọ 2013. Ha amụtala ụmụ nwoke atọ.

2) Daniel Akpeyi
Akpeyi bụ ochee goolu ndị Super Eagles lụrụ nwunye ya bụ Emmanuella n’afọ 2016.

View this post on Instagram

Am stronger

A post shared by Akpeyi Daniel (@akpeyidaniel) on

Ndị na-agba n’azụ:
3) William Troost-Ekong

Troost-Ekong na-ejidere ndị Super Eagles azụ, na enyi ya nwaanyị ayịruola afọ anọ. Enyi ya nwaanyị dị ime nwa ga-abụ nwa mbụ ha.

View this post on Instagram

????

A post shared by William Troost-Ekong (@wtroostekong) on

4) Kenneth Omeruo
Omeruo na-agbara ndị Super Eagles n’azụ, lụrụ nwunye ya bụ Chioma n’ọnwa Mee 2018.

View this post on Instagram

Thanksgiving Sunday ??

A post shared by Kenneth Omeruo (@omeruo) on

5) Chidozie Awaziem

Chidozie bidoro ịgbara Naịjirịa bọọlụ na 2017. Lee foto ya na enyi ya nwaanyị bụ Obiageli.

6) Elderson Echiejile
Echiejile lụrụ nwunye ya bụ Oghenevwemo n’afọ 2017. Ha mụrụ nwa ha nke mbụ n’ọnwa Maachị 2018.

Ndị egwu etiti
7) John Mikel Obi
Mikel na enyi ya nwaanyị bụ Olga Diyachenko ayịruola ihe ruru afọ ise. Ha mụrụ ụmụnwaanyị abụọ bụ ejima.

View this post on Instagram

Belated birthday lunch for my pooh2 ♥️ love you my poser

A post shared by Mikel Obi (@mikel_john_obi) on

8) Onazi Ogenyi
Onazi lụrụ nwunye ya bụ Sandra n’afọ 2015. Ha amụtala otu nwa nwaanyị.

9) Wilfred Ndidi
Ndidi bidoro ịgbara Super Eagles n’afọ 2015. Ya na enyi ya nwaanyị bụ Chidinma ayịruola afọ abụọ.

View this post on Instagram

My everything everyday ?

A post shared by W I L F R E D N D I D I (@ndidi25) on

10) Oghenekaro Etebo
Etebo bidoro ịgbara Naịjirịa n’afọ 2013. Ya na nwunye ya bụ Isi Ebhota amụtala otu nwa nwoke.

11) Joel Obi
Obi bidoro ịgbara Super Eagles n’afọ 2011. Ya na enyi ya nwaanyị amụtala otu nwa nwoke.

View this post on Instagram

Holiday with my ❤️❤️

A post shared by Joel Obi (@joelobi22) on

Ndị na-agba n’ihu
12) Odion Ighalo
Ighalo na nwunye ya bụ Sonia, alụọla ọtụtụ afọ. Ha mụtara ụmụ atọ bụ nwoke abụọ na otu nwaanyị.

Instagram post by ighalojude: Repost from @sjighalo24 using @RepostRegramApp - Nightlife??

13) Ahmed Musa
Musa lụrụ Juliet n’afọ 2017 ka ya na nwunye ya nke mbụ na nne ụmụ ya abụọ bụ Jamila gbasara.

View this post on Instagram

????

A post shared by Ahmed Musa MON (@ahmedmusa718) on

14)Victor Moses
Moses lụrụ nwunye ya bụ Josephine n’afọ 2017. Agbamakwụkwọ ya na-abịa ka ha mụchara ụmụ abụọ, otu nwoke nke a mụrụ n’afọ 2012 na nke nwaanyị a mụrụ n’afọ 2015.

Kedụ ndị ọzọ ị ma ụmụnwaanyị nọ na ndụ ha?

Continue Reading

Igbo

Asusu Igbo : Ihe ise ị kwesịrị ịma maka Alvan Ikoku

Published

on

Ụbọchị 18 nke ọnwa Nọvemba 2018, ga-eme ya afọ 47 Alvan Ikoku nwụrụ, mana kedụ ihe ị ma maka ya?
Alvan Ikoku so na ndị Igbo ji eme ọnụ, ya bụ ndị ọ ga-abụ akpọwa aha ndị Igbo bụ isi a hụrụ kwaba okpu ghara ịkpọ aha ya, a mara na ihe emebiela.

Nke a mere anyi ji chọọ icheta nwoke a n’ụbọchị ọ nwụrụ n’afọ 47 gara aga.
Lee ihe ndị ị kwesịrị ịma maka ya:

– A mụrụ ya n’afọ 1900, n’Amanagwu dị n’Arọchukwu dị n’Abịa steeti.

-Ya na Akanu Ibiam bụbu gọvanọ ebe a ma dịka “Eastern Region”, gakọrọ ụlọakwụkwọ “Hope Waddell Training Institution” otu oge. Ka ọ na-agụcha ka Nnamdi Azikiwe banyere ịgụ nke ya n’otu ebe ahụ.

-O kuzitere ọnụ ya na nkuzi, nke mere e ji ziga ya na mịnịstrị na-ahụ maka agụmakwụkwọ n’afọ 1946 ka ọ banyere n’ụlọomeiwu nke “Mpaghara ọwụwa-anyanwụ”. Nke a mere ka ọ bụrụ otu n’ime naanị ndị na-anọchite anya ọwụwa-anyanwụ atọ nọ n’ụlọomeiwu oge ahụ.

-O hibere ụlọakwụkwọ “Aggrey Memorial Secondary” n’Arọchukwu.

-E ji maka mbọ niile ọ gbara oge ọ na-arụrụ gọọmentị na ngalaba agụmakwụkwọ, hibe ụlọakwụkwọ “Alvan Ikoku Federal College of Education”, otu okporoụzọ dị na Maitama n’Abuja nakwa tinye ihu ya n’elu N10, ka e ji na-echeta ya.

Continue Reading

Igbo

Asusu Igbo : A mịpụla ego ọzọ n’akpa NLNG – Sineti.

Published

on

Ụlọomeiwu ukwu bụ Sineti ekwuola na ha achọpụtala ego dị otu ijeri dọla ndị ụlọọrụ NNPC mịpụrụ site n’akpaego ụlọọrụ na-ahụ maka mmanụ gaasị bụ NLNG.
Onyeisi Otu  mere nyocha ahụ bụ Bassey Albert Akpan agwala ndị NNPC na CBN ka ha gosi akwụkwọ eji mịpụ ego ahụ.

Continue Reading

Igbo

Nnamdi Kanu: Abaribe na ndị ọzọ a ga-akwụnye ụlọikpe nde narị naira(N100m)?

Published

on

Akụkọ na-eru anyị ntị site n’ụlọikpe ukwu di n’Abuja na-akọwa na ọkaikpe Binta Nyako enyela iwu ka ego Sịnetọ Eyinnaya Abaribe na mmadụ abụọ ọzọ jiri gbara Nnamdi Kanu aka ebe baa n’akpa ụlọikpe.
Ọkaikpe Nyako nyere iwu a iji megharị usoro oji nye Nnamdi Kanu n’aka Abaribe na mmadụ abụọ ọzọ n’ọnwa Eprelụ nke 2017.
Mgbe ahụ, Abaribe, Tochukwu Uchendu na Immauel Shalom ji akwụkwọ akụnaụba ha nara Maazị Kanu n’aka ụlọikpe.

Ugbua, Ọkaikpe Nyako sị ka ha kwụnye nde narị naira (100 million) n’ụlọakụ ụlọikpe.
BBC gbara otu onye metụtara Abaribe ajụjụ ọnụ maka mkpebi a, o were sị na onweghi ihe ngbagwojuanya dị na ya maka na ikpe ka na-aga n’ihu.
“Anyị aghaghị itinye ọnụ n’okwu a karịa ikwu na ikpe ka na-aga n’ihu. Ọ bụ ubọchị 28 nke Mach 2019 ka a ga-alaghachi ụlọikpe maka ya a.”
Ọkaikpe Nyako kwuru na ọbụghị Abaribe na ndị ọzọ a ka ọ na-ekpe ikpe.
“Ihe m chọrọ bụ ka ha kpọpụtara m Nnamdi Kanu,” Nyako kwuru mgbe ọ kpere ikpe taa.

Iwu ya bụ na Abaribe na mmadụ abụọ a nwere ọnwa abụọ iji kwunye ego a.
Cheta na ebidoro ịchọ Kanu ka ndi agha Naịjirịa na ụfọdụ ndị na-akwado ya kwakọrọ isi na be ya n’afọ 2017.
Ndị Ipob, bu otu Kanu nọ n’isi ha, kwuru na mmadụ 28 nwụru mgbe ndị agha wakporo be ya. Ndị agha kwuru na nke a abụghi eziokwu.
Kanu n’onwe ya sị na ọ bụ egwu na ndi agha ga egbu ya mere ojiri gbaa ọsọ.
Ọ sị na ya nọ Izrel ugbua, ma kwukwa na ya chọrọ ịlọta bịa zara ọnụ n’aka Binta Nyako, “ma ọ ọbụru na mba ụwa ga-ekwe nkwa na ikpe m ga akwu ọtọ”.

Continue Reading

Igbo

Asusu Igbo :Buhari Waec Certificate: Onyeisiala anatala asambodo ya

Published

on

Onye Ose foto Buhari bụ Bayo Omoboriowo, wepụtara foto gosiri ka Buhari natara asambodo ọhụrụ ngalaba na-ahụ maka ule na West Afrịka bụ Waec nyere ya.
Nke bụ na Waec etinyela mmechi n’akụkọ banyere ma Buhari onwere asambodo etu o si kwuo na o nwere.

Buhari kwukwara sị na ọ bụ ya na Shehu Musa Yar’Adua nwụrụ anwụ gakọrọ otu ụlọakwụkwọ ma na praịmarị ma na sekọndrị ma sorokwa banye ọzụzụ ndị agha otu oge.

O kwuru na ya na Yar’Adua lere ule Waec n’afọ 1961.
Otu n’ime ọnụ na-ekwuchitere Buhari bụ Bashir Ahmed tinyere ihe nkiri gosiri ka Buhari na-anata asambodo ya ebe n’elu Twitter:

 

Continue Reading

Igbo

Gịnị mere ụfọdụ ụmụnwoke ji ‘alụ’ nwabebi?

Published

on

Ọ bughi ịhe ọhụrụ na ụfọdụ ụmụnwoke na-ejizi nwabebi eme enyi, kama ihe mgbawoju anya bụ etu ha si azụta ya n’agbanyeghi na ọ dara ọnụ.
Nwoke akpọrọ “Pretty Mike of Lagos” zụtara nwa bebi dịka onyinye o nyere onwe ya n’ụbọchị ncheta ọmụmụ ya.

Kamgbe o wepụtachara foto gosiri ebe ya na nwabebi nọ, ndị mmadụ nọ soshal midia etinyela ọnụ n’okwu ahụ.
Cheta na n’ọnwa Mee nke afọ a, otu otiegwu akpọrọ Shuga Shaa bụ onye Delta steeti kwuru na ọ zụtara nwabebi ya n’ọnụ otu nde naira (N1,000,000).

Ọ zutaara ya ụgboala ma kpọrọ ya na-aga ụlọ ihe nkiri.

Etu o si kwụrụ ugbua, “Pretty Mike of Lagos” depụtara n’elu soshal midia na “ndị mmadụ na-ahụ nwabebi dịka nke e ji enwe mmekọrịta mana mụ onwe m na-ahụ ya dịka onye nkasiobi, onye na-anọkete m
nakwa onye na-agaghị agbaghapụ m.”

 

Continue Reading

Advertise with Us

Advertise your organization’s announcements and opportunities in enterNigeria’s daily email. Special rates for long-term buys. Email enternigeria@enternigeria.com for details.

 

Announcements, Arts & Books

 

Aguleri , The Citadel Of Igbo Civilisation

 

People

Meet the skin doctor : DR IFEOMA Ejikeme

DR IFEOMA Ejikeme, an NHS medical consultant and highly experienced aesthetic medicine doctor, has achieved more in her 34 years than most of us could hope to in a lifetime.
Medical director of the Adonia Clinic, Dr Ejikeme has travelled the globe for extensive training in medicine, including a postdoctoral fellowship in head and neck surgery.

 

 

ENTER NIGERIA Winning Sunday with The Young Netpreneur for the Week :Ken Nwadiogbu @kennwadio

 

Ken Nwadiogbu (b. 1994) is a Nigerian born Multidisciplinary Artist, popularly known as KenArt, whose practice is primarily centered around hyper-realistic drawings and works on paper.
Nwadiogbu believes that the society speaks- This voice inspires his art, which evaluates, interrogates and challenges socio-political structures and issues within the society. In his reply to this society, he is able to inspire one or two people to also re-valuate their socio-political structures as we know it. The desire to change his society and the way people think is what drives him to create art every day. Gender equality, African cultures, and Black power are a few aspects of his current research and artistic practice.
Nwadiogbu was born in Lagos, Nigeria and holds a B.Sc in Civil and Environmental Engineering from the University of Lagos, Nigeria. His art career started in the university, and with no formal training, has pushed him to become one of the most interesting young contemporary artists from Nigeria, creating works that question life- calling out some of the problems and becoming very grounded in human consciousness..
Nwadiogbu has been featured in lots of local and international group exhibitions and fairs, including the Insanity exhibition, sponsored by Frot Foundation, in Omenka Gallery, Nigeria; the TMC’s It’s Not Furniture, curated by Winifred Okpapi; the Artyrama’s group exhibition curated by Mr Jess Castellote; Art X Lagos, sponsored by Artyrama Gallery, in Lagos, Nigeria; the Moniker Art Fair, sponsored by Creative Debuts, in Brooklyn, NYC; the Anti-Trump show organised in UK; the Afriuture Exhibition by Ramati Art Africa in association with Commonwealth Africa Summit, in Toronto, Canada; amongst many others. He has been televised and publicized on different platforms like Guardian Life, Tush Magazine, WIRED Magazine, Candid Magazine, Bored Panda, BBC, CNN, and more as well as inspiring and encouraging young creatives through public speaking appearances like TEDx. He co-founded Artists Connect NG, the largest Nigerian artist gathering that took place at Lekki Leisure Lake, in Lagos, Nigeria.
To Nwadiogbu, Art is indeed timeless, it is his solace and hiding place, a safe haven he has found to be devoid of restrictions, boxes and boundaries.

 


 

 

Advertisement
December 2018
S M T W T F S
« Nov   Jan »
 1
2345678
9101112131415
16171819202122
23242526272829
3031  
Special Report/Investigation1 day ago

Nude video: Police arrest three suspects for humiliating woman in Anambra

Home1 day ago

Anambra government reaffirms the state government’s commitment on N30,000 new minimum wage

Business1 day ago

Elumelu Foundation disburses $15.2m to empower 3,050 entrepreneurs

Home1 day ago

I influenced 2019 elections – Tinubu admits

Photos/Videos1 day ago

In Pictures : President Muhammadu Buhari receives a delegation of the NUJ

Business1 day ago

30,000 PETTY TRADERS HAVE RECEIVED TRADER MONI LOANS SINCE AFTER ELECTIONS

Business1 day ago

Kindly ignore false claims as regards the suspension of the Trader Moni programme

Politics1 day ago

Supplementary polls: Vote any party of your choice – Buhari tells electorate

Education1 day ago

Buhari Signs Bill Stopping Engineering Graduates on NYSC from Teaching

Life & Style1 day ago

Dotun Adebayo on parenting: “It was all worth it”

Home1 day ago

European Union Congratulates President Buhari on Re-election

Politics1 day ago

Election Petition Tribunal Declares Adeleke Winner of Osun Election

Home1 day ago

Nigeria’s political transfer window is open

Home4 days ago

Smile Train CEO Lauds Mrs Obiano for helping Children with mouth deformity

Life & Style4 days ago

China to Build Cultural Center in Anambra

Business5 days ago

No plans to sell Lagos Trade Fair Complex – FG

Parliament5 days ago

House Suspend Plenary till 2nd April for 2019 Budget Defence by MDAs

Home5 days ago

Full Text : Senate Approves N30, 000 as National Minimum Wage

Home5 days ago

National Assembly elections Infographic

Parliament5 days ago

2019 Budget passes second reading in the Senate

Home2 weeks ago

Aguleri Monarch Igwe Idigo Begins Final Journey, Last Week Of March

Special Report/Investigation1 day ago

Nude video: Police arrest three suspects for humiliating woman in Anambra

Job Centre2 weeks ago

LIST OF ELIGIBLE CANDIDATES FOR 2019 NIGERIAN AIR FORCE ZONAL RECRUITMENT EXERCISE

Home4 weeks ago

Atiku rejects election result, heads to court

Home4 weeks ago

Infographics: How Buhari beat Atiku

Life & Style1 week ago

Winning Sunday with The Young Netpreneur for the Week :Ken Nwadiogbu @kennwadiogbu

Home4 weeks ago

UK confirms INEC results as authentic

Home1 week ago

Farewell to Influential Awkuzu Born Curator and Art Historian, Okwui Enwezor

Home2 weeks ago

Hon Ifeanyi Ibezi Wins Idemili North and South Federal Constituency

Home3 weeks ago

New National Minimum Wage: I will Be The First To Pay – Obiano

Special Report/Investigation4 weeks ago

Election victory: Igbos congratulate President Buhari

Home5 days ago

UPDATED : ANAMBRA AND CHINA STRENGTHEN BILATERAL TIES

Home2 weeks ago

Anambra State Govt. Alerts The Public On Politically Motivated Fake News About Govt. Building Mosques And Impending Herdsmen Attack

Home2 weeks ago

Breaking : My priority is to enlist Anambra as oil producing state – Obidigwe, rep-elect

Home4 weeks ago

Breaking: Nigeria election: Muhammadu Buhari re-elected as president

Education3 weeks ago

Jamb records increase in number of registered candidates

Home4 weeks ago

Muhammadu Buhari – Nigeria’s converted democrat comes back from the brink

Home3 weeks ago

Obiano and the judgement of history

Home4 weeks ago

World leaders felicitate with President Buhari on election victory

Home2 weeks ago

State House Of Assembly Election – Ndi Anambra Daalu Nu

Trending